13Ha na-anọ ụbọchị ndụ ha niile nʼọganihu, ha na-arịdakwa nʼili ha nʼudo.
14Ma ndị a na-asị Chineke, ‘Hapụ anyị aka, ọ dịghị anyị mkpa ịmata ụzọ gị.
15Onye ka Onye pụrụ ime ihe niile bụ, anyị ga-eji jeere ya ozi? Uru gịnị ka ịrịọ ya arịrịọ ga-abara anyị?’
16Ma ọganihu ha adịghị nʼaka ha ya mere ana m ewezuga onwe m site na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu.
17“Ma ugboro ole ka a na-emenyụ ọkụ oriọna nke ndị na-emebi iwu? Ugboro ole ka nhụju anya na-adakwasị ha, bụ nke Chineke kenyere ha nʼiwe ya?