12Ha na-abụ abụ nʼụda egwu otiti na ụbọ akwara; ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼụda nke ọja.
13Ha na-anọ ụbọchị ndụ ha niile nʼọganihu, ha na-arịdakwa nʼili ha nʼudo.
14Ma ndị a na-asị Chineke, ‘Hapụ anyị aka, ọ dịghị anyị mkpa ịmata ụzọ gị.
15Onye ka Onye pụrụ ime ihe niile bụ, anyị ga-eji jeere ya ozi? Uru gịnị ka ịrịọ ya arịrịọ ga-abara anyị?’
16Ma ọganihu ha adịghị nʼaka ha ya mere ana m ewezuga onwe m site na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu.