10Oke ehi ha na-agba nne ehi ha na-esepụghị aka; nne ehi ha na-amụ ụmụ, ha adịghị ekwo ime.
11Ha na-ezipụ ụmụ ha dịka igwe atụrụ; ụmụntakịrị ha na-etegharị egwu.
12Ha na-abụ abụ nʼụda egwu otiti na ụbọ akwara; ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼụda nke ọja.
13Ha na-anọ ụbọchị ndụ ha niile nʼọganihu, ha na-arịdakwa nʼili ha nʼudo.
14Ma ndị a na-asị Chineke, ‘Hapụ anyị aka, ọ dịghị anyị mkpa ịmata ụzọ gị.