9Ha na-ebi ndụ udo nʼezinaụlọ ha na-atụghị egwu na ihe ọjọọ ọbụla ga-adakwasị ha; mkpara Chineke adịghịkwa adakwasị ha.
10Oke ehi ha na-agba nne ehi ha na-esepụghị aka; nne ehi ha na-amụ ụmụ, ha adịghị ekwo ime.
11Ha na-ezipụ ụmụ ha dịka igwe atụrụ; ụmụntakịrị ha na-etegharị egwu.
12Ha na-abụ abụ nʼụda egwu otiti na ụbọ akwara; ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼụda nke ọja.
13Ha na-anọ ụbọchị ndụ ha niile nʼọganihu, ha na-arịdakwa nʼili ha nʼudo.