Job 21

“Ọ dị onye pụrụ izi Chineke ihe ọmụma, ebe ọ bụ ya na-ekpe ndị kachasị elu ikpe?

Job 21:22 (UKJV) Shall any teach God knowledge? seeing he judges those that are high.

20Ka anya ha hụ mbibi nke onwe ya, ka ha ṅụọ ọnụma nke Onye pụrụ ime ihe niile dịka mmiri.

21Gịnị gbasara ha banyere ezinaụlọ ha hapụrụ mgbe ọnwa ndị e kenyere ya bịara na ngwụcha?

22“Ọ dị onye pụrụ izi Chineke ihe ọmụma, ebe ọ bụ ya na-ekpe ndị kachasị elu ikpe?

23Otu onye na-anwụ mgbe o jupụtara nʼike na ume, mgbe ọ nọ na nchekwa na udo,

24mgbe ahụ ya bụ nke eji ezi nri zụọ nke ọma, ọkpụkpụ ya jupụtakwara nʼụmị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.