22“Ọ dị onye pụrụ izi Chineke ihe ọmụma, ebe ọ bụ ya na-ekpe ndị kachasị elu ikpe?
23Otu onye na-anwụ mgbe o jupụtara nʼike na ume, mgbe ọ nọ na nchekwa na udo,
24mgbe ahụ ya bụ nke eji ezi nri zụọ nke ọma, ọkpụkpụ ya jupụtakwara nʼụmị.
25Onye ọzọ na-anwụ nʼihe ilu nke mkpụrụobi, nʼihi na o nweghị mgbe o riri ezi ihe ọbụla.
26Nke ọbụla nʼime ha dina nʼakụkụ ibe ya nʼime aja, ikpuru kpuchikwara ha abụọ.