24mgbe ahụ ya bụ nke eji ezi nri zụọ nke ọma, ọkpụkpụ ya jupụtakwara nʼụmị.
25Onye ọzọ na-anwụ nʼihe ilu nke mkpụrụobi, nʼihi na o nweghị mgbe o riri ezi ihe ọbụla.
26Nke ọbụla nʼime ha dina nʼakụkụ ibe ya nʼime aja, ikpuru kpuchikwara ha abụọ.
27“Amaara m nke ọma ihe bụ echiche unu na nzube unu ji emegide m.
28Unu ga-ajụ m ajụjụ sị, ‘Ugbu a, ole ụlọ oke mmadụ ahụ. Ụlọ ikwu ndị ahụ ebe ndị na-emebi iwu biiri?’