Job 21

Gịnị mere ndị ajọ omume ji enwe ndụ ogologo, ghọọ okenye, baakwa ụba nʼịdị ike?

Job 21:7 (UKJV) Wherefore do the wicked live, become old, yea, are mighty in power?

5Lee m anya ka ahụ maa gị jijiji; were aka gị kpuchie ọnụ gị.

6Mgbe m chere echiche maka nke a, egwu tụrụ m meekwa ka ahụ m maa jijiji.

7Gịnị mere ndị ajọ omume ji enwe ndụ ogologo, ghọọ okenye, baakwa ụba nʼịdị ike?

8Ha na-ahụ ụmụ ka ha na-akwụsike ike gburugburu ha, ụmụ ha ka ha ji anya ha ahụ.

9Ha na-ebi ndụ udo nʼezinaụlọ ha na-atụghị egwu na ihe ọjọọ ọbụla ga-adakwasị ha; mkpara Chineke adịghịkwa adakwasị ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.