28Ihe i kpebiri ga-emezukwa, ìhè ga-amụkwasị nʼụzọ gị niile.
29Mgbe a na-eweda ndị mmadụ ala, ọ bụrụkwa na ị sị, ‘Bulienụ ha elu,’ mgbe ahụ ọ ga-azọpụta ndị e wedara nʼala.
30Ọ ga-azọpụta ọ bụladị onye ahụ nke aka ya na-adịghị ọcha, bụ onye nke a ga-azọpụta site nʼịdị ọcha nke aka gị.”