Job 27

egbugbere ọnụ m agaghị ekwu ihe ọjọọ, ire m agakwaghị ekwu okwu aghụghọ.

Job 27:4 (UKJV) My lips shall not speak wickedness, nor my tongue utter deceit.

2“Nʼezie, dịka Chineke na-adị ndụ, onye jụrụ ikpere m ikpe ziri ezi, Onye pụrụ ime ihe niile, onye mere ka m hụ ihe ilu nke mkpụrụobi.

3Ogologo mgbe m nwere ndụ nʼime m, mgbe iku ume Chineke dịkwa nʼimi m,

4egbugbere ọnụ m agaghị ekwu ihe ọjọọ, ire m agakwaghị ekwu okwu aghụghọ.

5Agaghị m ekwenye na ihe unu kwuru ziri ezi; ruo mgbe m ga-anwụ, agaghị m agọnarị izuoke m.

6Aga m ejigidesi ezi omume m aka ike, agaghị m ahapụ ya; o nwekwaghị mgbe obi m ga-ata m ụta ogologo ụbọchị niile nke ndụ m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.