16A gaghị eji ọlaedo nke Ọfịa zụta ya, a gaghị ejikwa nkume dara oke ọnụahịa nke ọniks maọbụ safaia zụta ya,
17A gaghị eji ọlaedo maọbụ kristal tụnyere ya, maọbụ iji ejiji ọlaedo nweta ya.
18Koral na jaspa erughị ihe a na-akpọtụ aha nʼebe ọ dị; ọnụahịa nke amamihe karịrị ọtụtụ rubi.
19A gaghị eji ọla topaazi nke Kush tụnyere ya; a pụghị iji ọlaedo a nụchara anụcha zụta ya.
20Olee ebe amamihe si abịa? Olee ebe nghọta bi?