21“Ụmụ mmadụ na-eji oke olileanya na-ege m ntị, ha na-ederekwa duu ịnụrụ ndụmọdụ m.
22Mgbe m kwụsịrị okwu, ha anaghị ekwukwa ọzọ. Okwu m na-ada juu na ntị ha.
23Ha na-echerekwa m dịka e si echere mmiri ozuzo, na-aṅụkwa okwu m dịka ala si aṅụ mmiri ozuzo nʼọkọchị.
24Mgbe m miiri ha ọnụ ọchị, ha adịghị ekwenye ya; ìhè nke ihu m dị oke mkpa nye ha.
25Ọ bụ m na-ahọpụtara ha ụzọ, na-anọdụ dịka onyeisi ha; ebiri m dịka a ga-asị na m bụ onye eze nʼetiti ndị agha ya; na dịka onye na-akasị ndị na-eru ụjụ obi.