7“Mgbe m na-apụ nʼọnụ ụzọ ama obodo were ọnọdụ m nʼama.
8Ụmụ okorobịa na-ahụ m wezuga onwe ha, ndị okenye na-ahụkwa m ma guzo nʼụkwụ ha;
9ndịisi ọchịchị obodo na-akwụsị ikwu okwu ma were aka ha kpuchie ọnụ ha;
10olu ndị a na-asọpụrụ na-adakwa jụụ, ire ha na-araparakwa ha nʼakpo ọnụ.
11Nʼoge ahụ, onye ọbụla nụrụ olu m na-ekwu ihe dị mma banyere m, ndị hụkwara m na-agba ama ọma maka m.