5Ka ọchịchịrị na onyinyo ọnwụ gbara ụbọchị ahụ dịka ụbọchị nke aka ya, ka igwe ojii kpuchigidekwa ya, ka ọchịchịrị kpuchie ya nʼebe ọ dị ukwuu.
6Abalị ahụ, ka oke ọchịchịrị kpuchie ya, ka a kachapụ ya, ka ọ hapụ ịbụkwa ụbọchị a ga-agụkọ ya na ụbọchị ndị ọzọ nʼafọ, ka ọ ghara dịka otu ụbọchị nke na-adị nʼọnwa.
7Ka abalị ụbọchị ahụ bụrụ ụbọchị tọgbọrọ nʼefu, ka a ghara ịnụ mkpu ọṅụ ọbụla nʼime ya.
8Ka ndị ahụ na-abụ ụbọchị ọnụ bụọ ụbọchị ahụ ọnụ, bụ ndị ahụ jikeere ịkpọte Leviatan.
9Ka kpakpando ụtụtụ ya gbaa ọchịchịrị, ka o lee anya ìhè na-efu, ka ọ ghara ihu mgbubere anya nke chi ọbụbọ,