10mgbe ahụ, ka nwunye m kwọọrọ nwoke ọzọ nri, ka ndị ikom ọzọ dinaa ya.
11Nʼihi na nke ahụ ga-abụ ihe ihere, bụrụkwa mmehie kwesiri ka e kpee ya ikpe.
12Ọ bụ ọkụ na-ere ruo nʼebe ịla nʼiyi; nke pụrụ ihopu ihe owuwe ubi m niile.
13“Ọ bụrụ na m jụrụ ikpe ikpe ziri ezi nye nwoke maọbụ nwanyị ọbụla na-ejere m ozi mgbe ha nwere mkpesa megide m,
14gịnị ka m ga-eme mgbe Chineke bịakwutere m? Gịnị ka m ga-aza ya mgbe ọ jụrụ m ajụjụ?