14gịnị ka m ga-eme mgbe Chineke bịakwutere m? Gịnị ka m ga-aza ya mgbe ọ jụrụ m ajụjụ?
15Ọ bụ na ọ bụghị onye kpụrụ m nʼafọ nne m mekwara ha? Ọ bụghị ya kpụrụ anyị abụọ nʼafọ nne anyị?
16“Ọ bụrụ na m ajụ inye ndị ogbenye ihe dị ha mkpa, ma ọ bụrụkwa na m eme ka anya nwanyị di ya nwụrụ dalaa ya nʼisi,
17ọ bụrụ na m dobere ihe oriri m maka naanị m, ma jụ inye ya ụmụ mgbei;
18ma site nʼokorobịa m, azụlitere m ha dịka nna kwesiri, ọ bụkwa site na nwantakịrị ka m bụ onyendu nye nwanyị di ya nwụrụ.