19Ọ bụrụ na ọ dị mgbe m hụrụ onye na-ala nʼiyi nʼihi enweghị akwa, maọbụ onye nọ nʼụkọ nke na-enweghị uwe,
20ma obi ha agọzighị m nʼihi iji ajị sitere nʼụmụ atụrụ m mee ka o nwee okpomọkụ nʼahụ ya.
21Ọ bụrụ na m eweliela aka m megide onye nna ya nwụrụ, nʼihi na m mara na m nwere nkwuwa okwu nʼụlọikpe,
22mgbe ahụ, ka aka m si nʼubu m dapụ, ka e tijiekwa ogwe aka m site na nkwonkwo ya.
23Nʼihi na atụrụ m egwu mbibi na-esite nʼaka Chineke, nʼihi egwu ebube ya, enweghị m ike ime ihe ndị a.