21Ọ bụrụ na m eweliela aka m megide onye nna ya nwụrụ, nʼihi na m mara na m nwere nkwuwa okwu nʼụlọikpe,
22mgbe ahụ, ka aka m si nʼubu m dapụ, ka e tijiekwa ogwe aka m site na nkwonkwo ya.
23Nʼihi na atụrụ m egwu mbibi na-esite nʼaka Chineke, nʼihi egwu ebube ya, enweghị m ike ime ihe ndị a.
24“Ọ bụrụ na ntụkwasị obi m dị nʼọlaedo, maọbụ na m sị ọlaedo a nụchara anụcha, ‘Ị bụ ebe ndabere m.’
25Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi oke akụ m, ihe nnweta nke aka m ritere nʼuru,