34nʼihi na m tụrụ egwu igwe mmadụ, si otu a, tụọ oke egwu nʼihi nleda anya nke ndị agbụrụ dị iche iche, nke mere ka m gbaa nkịtị ghara ịpụ nʼezi.
35(“O, a sị na o nwere onye ga-ege m ntị! Ana m ebinye aka m nʼokwu ngọpụ m, ka Onye pụrụ ime ihe niile za m, ka onye na-ebo m ebubo depụta ihe o nwere megide m nʼakwụkwọ.
36Nʼezie, aga m eyiri ya nʼubu m, aga m eyinyekwa ya dịka okpueze.
37Aga m agụkọrọ ya nzọ ụkwụ m niile, aga m ejekwuru ya dịka ọkpara eze.)
38“Ọ bụrụ na ala m etie mkpu megide m, ọ bụrụ na olulu dị na ya ejupụta nʼanya mmiri,