18Lezie anya ka mmadụ ọbụla ghara iji akụnụba rafuo gị; ekwekwala ka ihe ngarị bara ụba wezuga gị nʼọnọdụ gị.
19Akụnụba gị maọbụ ịdị ike gị ha pụrụ ịnapụta gị ka ị ghara ịnọ na mkpagbu?
20Anọla na-echere ka abalị bịa, mgbe a na-adọkpụrụ ndị ụmụ mmadụ site nʼụlọ ha pụọ.
21Lezie anya, ka i ghara iche ihu nye ajọ ihe, bụ nke ọ dị ka ị na-ahọrọ karịa mkpagbu.
22“E buliela Chineke elu nʼike ya, onye bụ onye ozizi dịka ya?