6Ọ naghị edebe ndị ajọ omume ndụ, kama ọ na-enye ndị a na-akpagbu akpagbu ihe ruuru ha.
7Ọ dịghị ewepụ anya ya nʼebe ndị ezi omume nọ, kama ọ na-eme ka ha na ndị eze nọkwasị nʼocheeze, bụrụ ndị e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi.
8Ma ọ bụrụ na e kechie ụmụ mmadụ nʼagbụ igwe, jirikwa agbụ nke mkpagbu jidesie ha ike,
9ọ na-agwa ha ihe ha mere, na ha sitere na nganga ha mehie.
10Ọ na-eme ka ha ṅaa ntị nye ntụziaka, na-enyekwa ha iwu ka ha chegharịa site nʼajọ ihe ha na-eme.