10mgbe m kpaara ya oke ebe ọ ga-akwụsị, tinye ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ya,
11mgbe m sịrị, ‘Ruo ebe a ka ị ga-asọrute, ị gaghị agabiga ya, nʼebe a ka a ga-akwụsị ebili mmiri mpako gị’?
12“O nweela oge i nyere ụtụtụ iwu, maọbụ mee ka chi ọbụbọ maara ọnọdụ ya,
13ka o jide akụkụ niile nke ụwa aka ma site nʼụwa yọpụ ndị mmebi iwu?
14Ụwa na-ewere ụdịdị ya dịka ụrọ a kakwasịrị akara; ụdịdị ya na-egosipụta dịka uwe.