6Nʼelu gịnị ka a tọrọ ntọala ya, onye doro nkume mbụ e ji tọọ ntọala ya?
7Mgbe kpakpando nke isi ụtụtụ zukọrọ bụọ abụ, ụmụ Chineke niile tisikwara mkpu ọṅụ ike?
8“Onye kara akara nye osimiri iwu ebe ọ ga-ejedebe mgbe o nupụtara dịka a ga-asị na o si nʼakpanwa pụta,
9mgbe m yikwasịrị ha igwe ojii dịka uwe, werekwa ọchịchịrị meere ya akwa okike,
10mgbe m kpaara ya oke ebe ọ ga-akwụsị, tinye ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ya,