Job 40

Ọkpụkpụ ya niile dịka ogidi bronz nwere ụmị, ọkpụkpụ ụkwụ na aka ya dịka okporo igwe.

Job 40:18 (UKJV) His bones are as strong pieces of brass; his bones are like bars of iron.

16Lee ike dị nʼukwu ya, leekwa ike dị nʼime afọ ya.

17Ọdụdụ ya ka ọ na-efegharị dịka osisi sida; akwara dị ya nʼahụ ka e jikọtara nke ọma.

18Ọkpụkpụ ya niile dịka ogidi bronz nwere ụmị, ọkpụkpụ ụkwụ na aka ya dịka okporo igwe.

19Ya onwe ya bụ otu nʼime ọrụ aka mbụ nke Chineke, ma naanị onye kere ya nwere ike iji mma agha bịa ya nso.

20Ugwu na-enye ya ihe ọ na-eri. Nʼebe ahụ kwa ka ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ na-anọ egwuri egwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.