4“Abụ m onye na-erughị eru. Oleekwanụ ka m ga-esi zaghachi gị? Eji m aka m kpuchie ọnụ m.
5Ekwuola m mbụ, ma enweghị m ọsịsa ọzọ kwuokwa ugboro abụọ, ma agaghị m ekwukwa ọzọ.”
6Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị:
7“Kwadoo onwe gị dịka dimkpa; enwere m ajụjụ m ga-ajụ gị, achọkwara m ka i nye m ọsịsa.
8“Ị ga-aga nʼihu ikwujọ ikpe ziri ezi m? Ị ga-aga nʼihu maa m ikpe ka ị si otu a bụrụ onye ikpe gaara?