22O nweela mgbe m sịrị unu, ‘Nyenụ ihe ọbụla nʼọnọdụ m, sitenụ nʼakụnụba unu kwụọ ụgwọ ịgbapụta m,
23gbapụtanụ m nʼaka ndị iro, maọbụ napụtanụ m nʼaka ndị na-enweghị obi ebere’?
24“Zienụ m ihe ga-eme ka m mechie ọnụ, gosi m ebe m si mejọọ.
25Eziokwu na-egbu mgbu nʼobi! Ma gịnị ka ịrụ ụka unu na-ewepụta?
26Ị chọrọ idozi okwu ọnụ m? Si otu a mee ka okwu onye ike gwụrụ ghọọ ikuku efu?