Juel 1

Yikwasịnụ onwe unu akwa mkpe, unu ndị nchụaja; ruonụ ụjụ, kwaanụ akwa, unu ndị na-eje ozi nʼebe ịchụ aja. Bịanụ, yiri akwa mkpe nọ ọnọdụ abalị unu ndị na-ejere Chineke m ozi nʼihi na egbochiela onyinye ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ ịbata nʼụlọ Chineke unu.

Joel 1:13 (UKJV) Gird yourselves, and lament, all of you priests: wail, all of you ministers of the altar: come, lie all night in sackcloth, all of you ministers of my God: for the food offering and the drink offering is withheld from the house of your God.

11Daanụ mba nʼobi unu, unu ndị ọrụ ubi, tienụ mkpu akwa, unu ndị ọrụ ubi vaịnị. Tienụ aka nʼobi nʼihi ọka wiiti na ọka balị, nʼihi na a laala owuwe ihe ubi nʼiyi.

12Osisi vaịnị anwụọla. Osisi fiig akpọnwụọla. Osisi pomegranet na osisi nkwụ, na osisi apụl akpọnwụọla. Nʼezie, osisi niile akpọnwụọla. Nʼebe ndị mmadụ nọ, ọṅụ alala.

13Yikwasịnụ onwe unu akwa mkpe, unu ndị nchụaja; ruonụ ụjụ, kwaanụ akwa, unu ndị na-eje ozi nʼebe ịchụ aja. Bịanụ, yiri akwa mkpe nọ ọnọdụ abalị unu ndị na-ejere Chineke m ozi nʼihi na egbochiela onyinye ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ ịbata nʼụlọ Chineke unu.

14Kpọsaanụ obubu ọnụ dị nsọ. Kpọọnụ nzukọta dị nsọ. Chịkọtaanụ ndị okenye na ndị niile bi nʼala a, ka ha bịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị Chineke unu; ka ha tikuo Onyenwe anyị mkpu akwa.

15Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ bụ! Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị abịala nso. Ọ ga-ewetakwa mbibi site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.