Juel 1

Gị Onyenwe anyị, ka m na-akpọku, nʼihi na ọkụ erepịala ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ. Ọkụ erechapụkwala osisi niile dị nʼọhịa.

Joel 1:19 (UKJV) O LORD, to you will I cry: for the fire has devoured the pastures of the wilderness, and the flame has burned all the trees of the field.

17Mkpụrụ ubi akpọnwụọla nʼọkpụrụkpụ aja ala. Ụlọ a na-edebe ihe oriri atọgbọrọla nʼefu, a kwatuola ọba niile, nʼihi na mkpụrụ ọka niile akpọọla nku.

18Lee otu anụ ụlọ niile si eze ume! Igwe ehi na-awagharị nʼihi na ha enweghị ebe ịta nri; ọ bụladị igwe atụrụ nọkwa nʼọnọdụ ịta ahụhụ.

19Gị Onyenwe anyị, ka m na-akpọku, nʼihi na ọkụ erepịala ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ. Ọkụ erechapụkwala osisi niile dị nʼọhịa.

20Ọ bụladị ụmụ anụ ọhịa na-ebeku gị akwa, nʼihi na iyi niile ataala, ọkụ erechapụkwala ebe ịta nri nke anụmanụ niile nke dị nʼọzara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.