Juel 3

na m ga-achịkọta mba niile nke ụwa, mee ka ha zukọọ na Ndagwurugwu Jehoshafat. Nʼebe ahụ, ka mụ onwe m ga-ama ha ikpe, nʼihi ihe ha mere ihe nketa m, na ndị nke m Izrel. Nʼihi na ha chụsasịrị ndị m nʼetiti mba niile, kee ala m nʼetiti onwe ha.

Joel 3:2 (UKJV) I will also gather all nations, and will bring them down into the valley of Jehoshaphat, and will plead with them there for my people and for my heritage Israel, whom they have scattered among the nations, and parted my land.

1“Nʼihi na, lee, nʼụbọchị ahụ, nʼoge ahụ, mgbe m ga-eweghachi akụnụba nke Juda na Jerusalem,

2na m ga-achịkọta mba niile nke ụwa, mee ka ha zukọọ na Ndagwurugwu Jehoshafat. Nʼebe ahụ, ka mụ onwe m ga-ama ha ikpe, nʼihi ihe ha mere ihe nketa m, na ndị nke m Izrel. Nʼihi na ha chụsasịrị ndị m nʼetiti mba niile, kee ala m nʼetiti onwe ha.

3Ha fere nza nʼihi ndị m, were ụmụ m ndị nwoke gbanwere ụmụ akwụna. Ha rere ụmụ m ndị nwanyị nʼihi mmanya, nʼihi inweta mmanya ha ga-aṅụ.

4“Ọ bụ gịnị ka unu nwere megide m, unu Taịa na Saịdọn, na unu obodo ahụ niile dị gburugburu ala ndị Filistia? O nwere ihe m mere nke unu na-akwụghachi m ụgwọ ya? Ọ bụrụ nʼezie na unu na-akwụghachi m ụgwọ, mụ onwe m ga-eji ọsọ kwụghachi unu ihe ọjọọ niile unu mere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.