37Mgbe mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ha tụgharịrị soro Jisọs.
38Mgbe Jisọs tụgharịrị hụ ka ha na-eso ya, ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ?” Ha sịrị ya, “Rabbi” (nke pụtara “Onye ozizi”), “olee ebe i bi?”
39Ọ sịrị ha, “Bịanụ, unu ga-ahụ.” Ha sooro ya ga hụ ebe ọ na-anọ. Ha nọnyekwara ya ụbọchị ahụ niile. Ọ bụ nʼihe dị ka elekere anọ nke mgbede.
40Otu nʼime mmadụ abụọ ahụ nụrụ ihe Jọn kwuru, nke sooro ya bụ Andru nwanne Saimọn Pita.
41Ihe mbụ o mere bụ ịchọta Saimọn nwanne ya sị ya, “Anyị achọtala Mezaya ahụ” (onye a na-akpọkwa Kraịst).