40Otu nʼime mmadụ abụọ ahụ nụrụ ihe Jọn kwuru, nke sooro ya bụ Andru nwanne Saimọn Pita.
41Ihe mbụ o mere bụ ịchọta Saimọn nwanne ya sị ya, “Anyị achọtala Mezaya ahụ” (onye a na-akpọkwa Kraịst).
42Ọ kpọtaara ya Jisọs. O lere ya anya sị, “Ị bụ Saimọn nwa Jọn. A ga-akpọ gị Sefas” (nke nsụgharị ya, pụtara Pita).
43Nʼechi ya, o kpebiri ịga Galili. Mgbe ọ hụrụ Filip, ọ sịrị ya, “Soro m.”
44Filip bụ onye obodo Betsaida dị ka Andru na Pita.