Jọn 1

Nʼechi ya, o kpebiri ịga Galili. Mgbe ọ hụrụ Filip, ọ sịrị ya, “Soro m.”

John 1:43 (UKJV) The day following Jesus would go forth into Galilee, and finds Philip, and says unto him, Follow me.

41Ihe mbụ o mere bụ ịchọta Saimọn nwanne ya sị ya, “Anyị achọtala Mezaya ahụ” (onye a na-akpọkwa Kraịst).

42Ọ kpọtaara ya Jisọs. O lere ya anya sị, “Ị bụ Saimọn nwa Jọn. A ga-akpọ gị Sefas” (nke nsụgharị ya, pụtara Pita).

43Nʼechi ya, o kpebiri ịga Galili. Mgbe ọ hụrụ Filip, ọ sịrị ya, “Soro m.”

44Filip bụ onye obodo Betsaida dị ka Andru na Pita.

45Filip chọtara Nataniel sị ya, “Anyị achọtala onye ahụ Mosis dere banyere ya nʼiwu, onye ndị amụma dekwara banyere ya, Jisọs onye Nazaret, nwa Josef.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.