7Ọ bịara dị ka onye akaebe ịgba ama banyere ìhè ahụ, ka mmadụ niile site nʼaka ya kwere.
8Ya onwe ya abụghị ìhè ahụ, ọ bịara naanị ịgba akaebe banyere ìhè ahụ.
9Ezi ìhè ahụ nke na-enye mmadụ ọbụla ìhè na-abịa nʼime ụwa.
10Ọ bịara nʼụwa, ma ụwa bụ ihe e kere site nʼaka ya, ma ụwa amataghị onye ọ bụ.
11Ọ bịakwutere ihe ndị ahụ bụ ndị nke ya, ma ndị ahụ bụ ndị nke ya anabataghị ya.