15Dị ka Nna ahụ maara m, mụ onwe m makwa Nna ahụ. Ana m atọgbọ ndụ m nʼihi atụrụ ahụ.
16Enwere m ụmụ atụrụ ọzọ ndị na-anọghị nʼọgba atụrụ a. Aghaghị m ịkpọbatakwa ha. Ha onwe ha ga-anụ olu m, a ga-enwekwa otu igwe atụrụ na otu onye ọzụzụ atụrụ.
17Maka nke a ka Nna jiri hụ m nʼanya, nʼihi na ana m atọgbọ ndụ m, ka m wereghachikwa ya ọzọ.
18O nweghị onye ọbụla pụrụ ịnara m ya, kama ana m atọgbọ ya nʼike nke onwe m. Enwere m ikike ịtọgbọ ya, nweekwa ikike iwereghachi ya ọzọ. Anatara m iwu a site nʼaka Nna m.”
19Ọzọkwa, nkewa batara nʼetiti ndị Juu nʼihi okwu ndị a.