17Maka nke a ka Nna jiri hụ m nʼanya, nʼihi na ana m atọgbọ ndụ m, ka m wereghachikwa ya ọzọ.
18O nweghị onye ọbụla pụrụ ịnara m ya, kama ana m atọgbọ ya nʼike nke onwe m. Enwere m ikike ịtọgbọ ya, nweekwa ikike iwereghachi ya ọzọ. Anatara m iwu a site nʼaka Nna m.”
19Ọzọkwa, nkewa batara nʼetiti ndị Juu nʼihi okwu ndị a.
20Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu, “Ọ bụ onye mmụọ ọjọọ na-achị ya, onye isi mebiri. Ọ bara uru ige ya ntị?”
21Ma ndị ọzọ na-ekwu, “Okwu ndị a adịghị ka nke onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya. Mmụọ ọjọọ o nwere ike ime ka anya onye kpuru ìsì meghee?”