Jọn 10

Ma ndị ọzọ na-ekwu, “Okwu ndị a adịghị ka nke onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya. Mmụọ ọjọọ o nwere ike ime ka anya onye kpuru ìsì meghee?”

John 10:21 (UKJV) Others said, These are not the words of him that has a devil. Can a devil open the eyes of the blind?

19Ọzọkwa, nkewa batara nʼetiti ndị Juu nʼihi okwu ndị a.

20Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu, “Ọ bụ onye mmụọ ọjọọ na-achị ya, onye isi mebiri. Ọ bara uru ige ya ntị?”

21Ma ndị ọzọ na-ekwu, “Okwu ndị a adịghị ka nke onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya. Mmụọ ọjọọ o nwere ike ime ka anya onye kpuru ìsì meghee?”

22Nʼoge ahụ, mmemme icheta mgbe e doro ụlọnsọ ukwu ahụ nsọ ruru na Jerusalem. Ọ bụ oge oke oyi,

23ma Jisọs nọ na-ejegharị nʼụlọnsọ ukwu, nʼịba Solomọn.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.