Jọn 10

Ma unu ekwenyeghị, nʼihi na unu esoghị nʼigwe atụrụ m.

John 10:26 (UKJV) But all of you believe not, because all of you are not of my sheep, as I said unto you.

24Ndị Juu gbara ya gburugburu sị ya, “Ruo ole mgbe ka ị ga-edebe anyị nʼọnọdụ olileanya? Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst ahụ, gwaghee anyị ọnụ.”

25Jisọs zara ha, “Agwara m unu, ma unu ekweghị. Ọrụ m na-arụ nʼaha Nna m na-agba ama banyere m.

26Ma unu ekwenyeghị, nʼihi na unu esoghị nʼigwe atụrụ m.

27Atụrụ m na-anụ olu m. Amaara m ha, ha na-esokwa m.

28Ana m enye ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala nʼiyi. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike ịpụnarị ha nʼaka m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.