25Jisọs zara ha, “Agwara m unu, ma unu ekweghị. Ọrụ m na-arụ nʼaha Nna m na-agba ama banyere m.
26Ma unu ekwenyeghị, nʼihi na unu esoghị nʼigwe atụrụ m.
27Atụrụ m na-anụ olu m. Amaara m ha, ha na-esokwa m.
28Ana m enye ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala nʼiyi. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike ịpụnarị ha nʼaka m.
29Nna m onye nyere m ha dị ukwuu karịa ihe niile. O nweghị onye nwere ike ịnapụ ha site nʼaka Nna m.