34Jisọs zara ha, “Edeghị ya nʼiwu unu, sị, ‘Mụ onwe m sịrị na unu bụ chi’?
35Ọ bụrụ na a kpọrọ ndị ahụ nabatara okwu Chineke ‘chi,’ apụghịkwa imebi ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ.
36Unu na-ekwu na onye ahụ Chineke doro nsọ ma zitekwa ya nʼime ụwa na-ekwulu Chineke nʼihi na m sịrị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke?’
37Unu ekwenyela na m, ma ọ bụrụ na ọ bụghị ọrụ Nna m ka m na-arụ.
38Ma ọ bụrụ na m na-arụ ya, a sịkwarị na unu ekweghị na m, kwerenụ nʼọrụ ndị a, ka unu nwee ike mata ma ghọtakwa na Nna ahụ nọ nʼime m, mụ onwe m nọkwa nʼime Nna ahụ.”