33Ndị Juu zara ya, “Anyị achọghị ịtụ gị nkume nʼihi ọrụ ọma ndị a, kama nʼihi nkwulu na nʼihi na gị bụ mmadụ efu, ma ị na-eme onwe gị Chineke.”
34Jisọs zara ha, “Edeghị ya nʼiwu unu, sị, ‘Mụ onwe m sịrị na unu bụ chi’?
35Ọ bụrụ na a kpọrọ ndị ahụ nabatara okwu Chineke ‘chi,’ apụghịkwa imebi ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ.
36Unu na-ekwu na onye ahụ Chineke doro nsọ ma zitekwa ya nʼime ụwa na-ekwulu Chineke nʼihi na m sịrị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke?’
37Unu ekwenyela na m, ma ọ bụrụ na ọ bụghị ọrụ Nna m ka m na-arụ.