39Ọzọkwa, ha gbalịrị ijide ya ma ọ siri nʼaka ha pụọ.
40Mgbe ahụ ọ laghachiri azụ nʼofe osimiri Jọdan, bụ ebe Jọn nọrọ na mbụ mee baptizim, ebe ahụ ka ọ nọdụrụ.
41Ọtụtụ ndị mmadụ bịakwutere ya. Ha na-asị, “Jọn arụghị ọrụ ihe ịrịbama ọbụla, ma ihe niile Jọn kwuru banyere nwoke a bụ eziokwu.”
42Ọtụtụ mmadụ kwenyekwara na ya nʼebe ahụ.