6Jisọs ji ihe yiri ihe gwa ha okwu. Ma ha aghọtaghị ihe ọ nọ na-agwa ha.
7Ọzọ, Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, ana m agwa unu, mụ onwe m bụ ọnụ ụzọ ọgba atụrụ ahụ.
8Ndị niile bịara tupu mụ onwe m abịa bụ ndị ohi na ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Ụmụ atụrụ aṅakwaghị ha ntị.
9Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọbụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ na-abata na-achọtakwa nri.
10Onye ohi na-abịa naanị ka o zuo ohi, gbuo ma bibiekwa; abịara m ka ha nwe ndụ ma nwebigakwa ya oke.