19Ma ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Mata na Meri ịkasị ha obi nʼihi ọnwụ nwanne ha nwoke.
20Mgbe ozi ọbịbịa Jisọs ruru Mata ntị, ọ gara izute ya, ma Meri nọdụrụ nʼụlọ.
21Mata sịrị Jisọs, “Onyenwe m, a sị na ị nọ nʼebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.
22Ma ugbu a, amara m na Chineke ga-enye gị ihe ọbụla ị rịọrọ.”
23Jisọs sịrị ya, “Nwanne gị nwoke ga-ebili ọzọ.”