18Betani dị Jerusalem nso, ihe dị ka kilomita atọ.
19Ma ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Mata na Meri ịkasị ha obi nʼihi ọnwụ nwanne ha nwoke.
20Mgbe ozi ọbịbịa Jisọs ruru Mata ntị, ọ gara izute ya, ma Meri nọdụrụ nʼụlọ.
21Mata sịrị Jisọs, “Onyenwe m, a sị na ị nọ nʼebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.
22Ma ugbu a, amara m na Chineke ga-enye gị ihe ọbụla ị rịọrọ.”