Jọn 11

Mgbe Jisọs nụrụ ya, ọ sịrị, “Ọrịa a abụghị nke ọnwụ kama ọ bụ iji nye Chineke otuto nakwa ka e site na ya nye Ọkpara Chineke otuto.”

John 11:4 (UKJV) When Jesus heard that, he said, This sickness is not unto death, but for the glory of God, that the Son of God might be glorified thereby.

2Nke a bụ Meri ahụ weere mmanụ otite dị oke ọnụahịa tee Onyenwe anyị, ma jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Ọ bụ nwanne ya nwoke Lazarọs bụ onye nọ nʼọrịa.

3Nke a mere ụmụnne ya nwanyị zigara Jisọs ozi sị, “Onyenwe anyị, onye ahụ nke ị hụrụ nʼanya nọ nʼọrịa.”

4Mgbe Jisọs nụrụ ya, ọ sịrị, “Ọrịa a abụghị nke ọnwụ kama ọ bụ iji nye Chineke otuto nakwa ka e site na ya nye Ọkpara Chineke otuto.”

5Jisọs hụrụ Mata, na nwanne ya nwanyị na Lazarọs nʼanya.

6Mgbe ọ nụrụ na Lazarọs nọ nʼọrịa, ọ nọkwuru mkpụrụ ụbọchị abụọ nʼebe ahụ ọ nọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.