4Mgbe Jisọs nụrụ ya, ọ sịrị, “Ọrịa a abụghị nke ọnwụ kama ọ bụ iji nye Chineke otuto nakwa ka e site na ya nye Ọkpara Chineke otuto.”
5Jisọs hụrụ Mata, na nwanne ya nwanyị na Lazarọs nʼanya.
6Mgbe ọ nụrụ na Lazarọs nọ nʼọrịa, ọ nọkwuru mkpụrụ ụbọchị abụọ nʼebe ahụ ọ nọ.
7Ya mere, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Ngwanụ ka anyị laghachi azụ na Judịa.”
8Ma ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onye ozizi, nʼoge nta gara aga ka ndị Juu chọrọ ịtụ gị nkume. Ị na-agakwa ebe ahụ ọzọ?”