43Mgbe o kwusiri nke a, o jiri oke olu tie mkpu, “Lazarọs, pụta!”
44Onye ahụ nwụrụ anwụ pụtara, e jikwa akwa ozu kekọta aka ya na ụkwụ ya, werekwa akwa ịchafu kechie ihu ya. Jisọs sịrị ha, “Tọpụnụ ya, hapụ ya ka ọ laa.”
45Ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Meri bụ ndị hụrụ ihe a o mere, kwere na ya.
46Ma ụfọdụ nʼime ha lara gaa kọọrọ ndị Farisii ihe o mere.
47Mgbe ahụ, ndịisi nchụaja na ndị Farisii kpọrọ nzukọ ndị Sanhedrin. Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme? Nʼihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịbama.