45Ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Meri bụ ndị hụrụ ihe a o mere, kwere na ya.
46Ma ụfọdụ nʼime ha lara gaa kọọrọ ndị Farisii ihe o mere.
47Mgbe ahụ, ndịisi nchụaja na ndị Farisii kpọrọ nzukọ ndị Sanhedrin. Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme? Nʼihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịbama.
48Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya ka ọ gaa nʼihu, mmadụ niile ga-ekwere na ya. Ndị Rom ga-abịakwa, kwatuo ụlọnsọ ukwu ma napụ anyị obodo anyị.”
49Ma otu onye nʼime ha bụ Kaịfas, onyeisi nchụaja nʼafọ ahụ sịrị ha, “Unu amaghị ihe ọbụla.