18Ọtụtụ mmadụ pụrụ izute ya nʼihi na ha nụrụ akụkọ ọrụ ihe ịrịbama niile ọ rụrụ.
19Ya mere, ndị Farisii sịrịtara onwe ha, “Unu ahụla na o nweghị ihe unu pụrụ ime, leenụ ka ụwa niile na-eso ya.”
20Ma ụfọdụ ndị Griik so nʼime ndị ahụ bịara ife ofufe nʼoge mmemme ahụ.
21Ha bịakwutere Filip onye si Betsaida dị na Galili, gwa ya sị, “Nna anyị ukwu, anyị chọrọ ịhụ Jisọs.”
22Filip pụrụ gaa gwa Andru, ya na Andru sooro gaa gwa Jisọs.