Jọn 12

Filip pụrụ gaa gwa Andru, ya na Andru sooro gaa gwa Jisọs.

John 12:22 (UKJV) Philip comes and tells Andrew: and again Andrew and Philip tell Jesus.

20Ma ụfọdụ ndị Griik so nʼime ndị ahụ bịara ife ofufe nʼoge mmemme ahụ.

21Ha bịakwutere Filip onye si Betsaida dị na Galili, gwa ya sị, “Nna anyị ukwu, anyị chọrọ ịhụ Jisọs.”

22Filip pụrụ gaa gwa Andru, ya na Andru sooro gaa gwa Jisọs.

23Jisọs zara sị, “Oge awa ahụ eruola mgbe a ga-enye Nwa nke Mmadụ otuto.

24Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na mkpụrụ ọka wiiti adaghị nʼala nwụọ, ọ ga-anọ naanị ya. Ma ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ ga-amị ọtụtụ mkpụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.